Proverbs 31

Okwu eze Lemuel

1Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.

2Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m.
Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
3Enyela ụmụ nwanyị
Okwu a, ụmụ nwanyị, bụ banyere ọtụtụ ndị inyom bi nʼụlọeze. Onye dere akwụkwọ a, eleghị anya, na-arụtụ aka na ụmụ nwanyị ndị a, pụrụ ime ka uche eze pụọ site nʼihe o kwesiri ime. Est 2:3,8
ike gị,
enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.

4Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya.
O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya
bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
5Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru.
Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
6Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi,
ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
7Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha,
ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.

8Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha;
kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
9Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi.
Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.

Okwu mmechi: Ezi nwanyị nwere agwa ọma

10Nwanyị nwere ugwu
Maọbụ, Nwanyị nwere agwa ọma na-ejidekwa onwe ya nʼụzọ kwesiri.
onye ga-achọtali ya?
Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
11Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,
ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
12Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.
Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi
jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya
dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
15Tupu chi abọzie,
nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,
ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.
Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.
Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;
ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;
mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
20Ọ na-agbasapụ aka
inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche
nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina,
ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo
Nʼoge ochie, naanị ndị ọgaranya na-eyi uwe na-acha odo odo, nʼihi na ọ bụ akwa dị oke ọnụ.
dụọ.
23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo
Ọnụ ụzọ ama obodo bụ ebe ndị okenye na-ezukọta akparịta ụka. Jen 19:1; Rut 4:1-3

ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,
ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
25Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.
Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
26Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu
ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
27Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,
ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;
otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
29Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha,
ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.
Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara.
Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.
Copyright information for IboBIU